10. Ben-hesed, n'Arubot; ya nwere Soko na ala Hefa nile:
11. Ben-abinadab, n'ebe nile di elu nke Doa; Tafat nwa Solomon ka ọ nwere na nwunye:
12. Beana nwa Ahailud, nime Teanak na Megido, na Bet-shean nile nke di n'akuku Zaretan, n'okpuru Jezreel, site na Bet-shean rue Ebel-mehola, rue ofè Jọkmeam:
13. Ben-geba, nime Remot-gilead; ya nwere Havot nke Jaia nwa Manase, nke di na Gilead; ya nwere akuku Agob, nke di na Beshan, ọgu obodo uku atọ nke nwere mb͕idi na nkpọrọ ọla:
14. Ahinadab nwa Ido, nime Mahanaim:
15. Ahimaaz, nime Naftali; onye ahu lu-kwa-ra Basemat nwa Solomon na nwunye:
16. Beana nwa Hushai, n'Asha na Bealot:
17. Jehoshafat nwa Parua, n'Isaka:
18. Shimai nwa Ila, nime Benjamin:
19. Gebea nwa Uri, n'ala Gilead, bú ala Saihon eze ndi-Amorait na nke Og, bú eze Beshan; ma nání ya bu onye edoro onye-isi nke di n'ala ahu.
20. Juda na Israel di ọtutu, dika ájá nke di n'akuku oké osimiri n'iba-uba, nēri ihe, nāṅu kwa ihe-ọṅuṅu, nāṅuri kwa ọṅu.
21. Solomon we nāchi ala-eze nile site n'Osimiri rue ala ndi Filistia, ru kwa ókè-ala Ijipt: ha nēweta nso onyinye-inata-iru-ọma, nēfè kwa Solomon òfùfè ubọchi nile nke ndu-ya.
22. Ihe-oriri Solomon nke diri otù ubọchi bu kwa orú ọtùtù ọka na iri nke utu ọka flour, na ọgu ọtùtù ọka atọ nke utu ọka;