Bible Nso

1. Ndi-Eze 20:18-24 Bible Nso (IGBOB)

18. Ọ si, Ọ buru na ọ bu okwu udo ka ha putaworo, jidenu ha na ndu: ọ buru kwa na ọ bu ibu agha ka ha putaworo, jidenu ha na ndu.

19. Ma ndia siri n'obodo pua, bú umu-okorọbia nke ndi-isi ala anāchi achi, na usu-ndi-agha ndi soro ha n'azu.

20. Ha we tib͕ue, nwoke ọ bula nwoke-ibe-ya; ndi Siria we b͕alaga, Israel we chua ha n'azu: Ben-hedad, bú eze Siria, we wepuga onwe-ya n'elu inyinya, ya na ndi-inyinya.

21. Eze Israel we pua, tib͕ue inyinya na ub͕ọ-ala, o tib͕u-kwa-ra ntib͕u uku n'etiti ndi Siria.

22. Onye-amuma ahu we biarue eze Israel nso, si ya, Je ime onwe-gi ka i di ike, mara, hu kwa ihe i nēme: n'ihi na n'ọb͕ub͕a arọ ka eze Siria ganārigota imegide gi.

23. Ma ndi-orù eze Siria siri ya, Chi ukwu ka chi-ha bu; n'ihi ya ka ha di ike kari ayi: ma otú ọ di, ka ayi buso ha agha n'ala di lari, ayi aghaghi kwa idi ike kari ha.

24. Ma me ihe a; wezuga ndi-eze, nwoke ọ bula n'ebe-ya, do ndi nāchi ala n'ọnọdu ha: