Bible Nso

1. Ndi-Eze 18:39-46 Bible Nso (IGBOB)

39. Ndi Israel nile we hu ya, da kpue iru-ha n'ala, si, Jehova, Ya onwe-ya bu Chineke; Jehova, Ya onwe-ya bu Chineke.

40. Elaija we si ha, Jidenu ndi-amuma Beal; ekwela ka otù nwoke nime ha wepuga onwe-ya. Ha we jide ha: Elaija we me ka ha ridarue miri-iyi Kaishon, o b͕ue ha n'ebe ahu.

41. Elaija we si Ehab, Rigo, rie ihe ṅu kwa ihe-ọṅuṅu; n'ihi na olu ùzù oké miri-ozuzo nāda.

42. Ehab we rigo iri ihe na iṅu ihe-ọṅuṅu. Ma Elaija rigoro n'elu ugwu Kamel; o ruru ala, tiye iru-ya n'etiti ikperè-ya abua.

43. Ọ si nwa-okorọbia-ya, Biko, rigo, legide anya n'uzọ oké osimiri. Ọ rigo, legide anya, si, Ọ dighi ihe ọ bula di. Ọ si, Jeghachi ub͕ò asa.

44. O rue, na nke ub͕ò asa, na ọ siri, Le, igwe-oji, nke di ntà dika ọbu-aka madu, nēsi n'oké osimiri rigoputa. Ọ si, Rigo, si Ehab, Dozie ub͕ọ-ala-gi, rida, ka miri-ozuzo we ghara ib͕ochi gi.

45. O rue, na nwa mb͕e ntà, na elu-igwe jiri nji n'igwe-oji na ifufe, oké miri-ozuzo di uku we di. Ehab we nọkwasi n'ub͕ọ-ala, la na Jezreel.

46. Aka Jehova we di n'aru Elaija; o we ke ihe-ọkiké n'úkwù-ya, b͕a ọsọ n'iru Ehab, rue ebe i nābà Jezreel.