Bible Nso

1. Ndi-Eze 18:36-42 Bible Nso (IGBOB)

36. O rue, na mb͕e nsure onyinye-inata-iru-ọma, na Elaija, bú onye-amuma, biaruru nso, si, Jehova, bú Chineke Abraham na Aisak na Israel, ka amara ta na Gi onwe-gi bu Chineke n'Israel, na mu onwem bu kwa orù-Gi, na ọ bu kwa n'okwu-Gi ka m'meworo ihe nile ndia.

37. Zam, Jehova, zam, ka ndi nka we mara na Gi onwe-gi, Jehova, bu Chineke, na Gi onwe-gi echighariwo kwa obi-ha ilata.

38. Ọku Jehova we da, ripia àjà-nsure-ọku ahu, na nkú-ya, na nkume nile, na àjà, rachapu kwa miri nke di n'ebe ahu miri dọrọ.

39. Ndi Israel nile we hu ya, da kpue iru-ha n'ala, si, Jehova, Ya onwe-ya bu Chineke; Jehova, Ya onwe-ya bu Chineke.

40. Elaija we si ha, Jidenu ndi-amuma Beal; ekwela ka otù nwoke nime ha wepuga onwe-ya. Ha we jide ha: Elaija we me ka ha ridarue miri-iyi Kaishon, o b͕ue ha n'ebe ahu.

41. Elaija we si Ehab, Rigo, rie ihe ṅu kwa ihe-ọṅuṅu; n'ihi na olu ùzù oké miri-ozuzo nāda.

42. Ehab we rigo iri ihe na iṅu ihe-ọṅuṅu. Ma Elaija rigoro n'elu ugwu Kamel; o ruru ala, tiye iru-ya n'etiti ikperè-ya abua.