Bible Nso

1. Ndi-Eze 11:40-43 Bible Nso (IGBOB)

40. Solomon we chọ ime ka Jeroboam nwua: Jeroboam we bilie, b͕alaga n'Ijipt jekuru Shaishak, bú eze Ijipt, ọ we nọ n'Ijipt rue ọnwu Solomon.

41. Ma okwu Solomon nile nke fọduru, na ihe nile O mere, na amam-ihe-ya, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ okwu Solomon?

42. Ma ubọchi nile Solomon bu eze Israel nile nime Jerusalem di ọgu arọ abua.

43. Solomon we so nna-ya-hà dina n'ọnwu, elìe ya n'obodo Devid, bú nna-ya: Rehoboam, bú nwa-ya, we buru eze n'ọnọdu ya.