Bible Nso

1. Ndi-Eze 10:26-29 Bible Nso (IGBOB)

26. Solomon we chikọta ub͕ọ-ala na ndi-inyinya: o we nwe nnù ub͕ọ-ala atọ na ọgu iri, na orú nnù ndi-inyinya na nnù iri, ọ we do ha n'obodo ub͕ọ-ala, na n'ebe eze nọ na Jerusalem.

27. Eze we me ọla-ọcha ka ọ di ka nkume na Jerusalem, ọ me-kwa-ra osisi cedar ka ha di ka osisi sycomore nke di n'ebe di ala n'uba.

28. Anēme kwa ka inyinya Solomon nwere si n'Ijipt puta; n'usu ka ndi-ahia eze nānara ha, otù usu n'ọnu-ahia-ya.

29. Otù ub͕ọ-ala we rigota si n'Ijipt puta na nnù shekel ọla-ọcha na ọgu iri, na otù inyinya n'ọgu shekel asa na iri: otú a ka ha nēweputara eze nile nke ndi Het, nēweputa-kwa-ra ndi-eze Siria, site n'aka-ha.