Bible Nso

1. Ndi-Eze 1:44-53 Bible Nso (IGBOB)

44. eze we ziga Zedok, bú onye-nchu-àjà, na Netan, bú onye-amuma, na Benaia nwa Jehoiada, na ndi Keret na ndi Pelet, tiyere ya, ha emewo kwa ka ọ nọkwasi inyinya mule eze nwere:

45. Zedok, bú onye-nchu-àjà, na Netan, bú onye-amuma, etewo kwa ya manu ibu eze na Gaihon: ha esiwo kwa n'ebe ahu rigo nāṅuri ọṅu, obodo we b͕a aghara. Nka bu olu unu nuworo,

46. Ọzọ kwa, Solomon anọkwasiwo n'oche-eze nke ala-eze.

47. Ọzọ kwa, ndi-orù eze biara igọzi onye-nwe-ayi, bú eze Devid, si, Chineke-gi me ka aha Solomon di nma kari aha-gi, me kwa ka oche-eze-ya di uku kari oche-eze-gi: eze we kpọ isi ala n'elu ihe-ndina-ya.

48. Ọzọ kwa, otú a ka eze siri, Onye agọziri agọzi ka Jehova, bú Chineke Israel, bu, Onye nyeworom ta onye nānọkwasi n'oche-ezem, anyam nāhu kwa ya.

49. Ndi nile akpọrọ akpọ ndi Adonaija nwere we ma jijiji, bilie, je, nwoke ọ bula n'uzọ-ya.

50. Ma Adonaija turu egwu n'ihi Solomon; o we bilie, je, jide mpi ebe-ichu-àjà.

51. Ewe gosi Solomon, si, Le, Adonaija nātu egwu eze, bú Solomon: ma, le, o jidewo mpi ebe-ichu-àjà aka, si, Ka eze, bú Solomon, buru uzọ ṅuaram iyi na ọ gaghi-ewere mma-agha me ka orù-ya nwua.

52. Solomon we si, Ọ buru na ọ ghọ onye nēme nke-ọma, ọ dighi otù nime agiri-isi-ya gāda n'ala: ma ọ buru na ahuta ihe ọjọ n'aru ya, ọ gānwu kwa.

53. Eze, bú Solomon, we ziga, ha we me ka o si n'ebe-ichu-àjà rida. Ọ we bia kpọ isi ala nye eze Solomon: Solomon we si ya, La n'ulo-gi.