Bible Nso

1. Ndi-Eze 1:15-26 Bible Nso (IGBOB)

15. Bat-sheba we bakuru eze rue ime-ulo: ma eze aghọwo agadi nke-uku: Abishag, bú nwayi Shunem, nēje-kwa-ra eze ozi.

16. Bat-sheba we rube isi, kpọ isi ala nye eze. Eze we si, Gini ka i nāchọ?

17. Ọ si ya, Onye-nwem, gi onwe-gi were Jehova, bú Chineke-gi, ṅuara orù-gi nwayi iyi, si, N'ezie Solomon nwa-gi gābu eze mb͕e m'nwusiri, ya onwe-ya gānọkwasi kwa n'oche-ezem.

18. Ma ub͕u a, le, Adonaija aghọwo eze; ma ub͕u a, onye-nwem, bú eze, i maghi ya:

19. o we chiri ehi na anu mara abuba na ìgwè ewu na aturu riri nne chua àjà, kpọ kwa umu-ndikom nile nke eze, kpọ kwa Abaiata, bú onye-nchu-àjà, kpọ kwa Joab, bú onye-isi usu-ndi-agha: ma ọ kpọghi Solomon, bú orù-gi.

20. Ma gi onwe-gi, onye-nwem, bú eze, anya Israel nile dikwasi gi, ka i we gosi ha onye gānọkwasi n'oche-eze onye-nwem, bú eze, mb͕e ọ nwusiri.

21. Ma emeghi otú a, o gēru kwa, mb͕e onye-nwem, bú eze, soro nna-ya-hà dina n'ọnwu, na agāgu mu onwem na nwam, bú Solomon, na ndi-nmehie.

22. Ma, le, mb͕e ọ nọ nākpayere eze uka, Netan, bú onye-amuma, bata-kwa-ra.

23. Ha we gosi eze, si, Le, Netan, bú onye-amuma. O we bata n'iru eze, kpọ isi ala nye eze, kpuchie iru-ya n'ala.

24. Netan we si, Onye-nwem, bú eze, Ọ̀ bu gi onwe-gi siri, Adonaija gābu eze mb͕e m'nwusiri, ya onwe-ya gānọkwasi kwa n'oche-ezem?

25. N'ihi na ọ ridawo ta, chiri ehi na anu mara abuba na ìgwè ewu na aturu riri nne chua àjà, kpọ kwa umu-ndikom nile nke eze, kpọ kwa ndi-isi usu-ndi-agha, kpọ kwa Abaiata, bú onye-nchu-àjà; ma, le, ha nēri ihe nāṅu kwa ihe-ọṅuṅu n'iru ya, si, Ka eze, bú Adonaija, di ndu.

26. Ma ọ kpọghm, ọbuná mu onwem, bú orù-gi, ọ kpọghi kwa Zedok, bú onye-nchu-àjà, ọ kpọghi kwa Benaia nwa Jehoiada, ọ kpọghi kwa Solomon, bú orù-gi.