Bible Nso

1. Ndi-Eze 1:1-6 Bible Nso (IGBOB)

1. Ma eze, bú Devid, ghọrọ agadi, ubọchi ndu-ya nāgwu; ha we chiri uwe kpuchie ya aru, ma aru-ya ekpoghi ọku.

2. Ndi-orù-ya we si ya, Ka ha chọrọ onye-nwem, bú eze, nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke: ka o guzo kwa n'iru eze, nēkposo kwa ya aru ọku; ka o dina kwa n'obi-gi, ka aru onye-nwem, bú eze, we kpo ọku.

3. Ha we chọ nwa-ab͕ọghọ mara nma n'ókè-ala nile nke Israel, we chọta Abishag onye Shunem, me ka ọ biakute eze.

4. Nwa-ab͕ọghọ ahu mara nma nke-uku; o we nēkposo eze aru ọku, je-kwa-ra ya ozi; ma eze amaghi aru-ya.

5. Ma Adonaija nwa Hagit nēweli onwe-ya elu, si, Mu onwem gābu eze: o we doziere onwe-ya ub͕ọ-ala, na ndi-inyinya, na ọgu ndikom abua na iri ndi nāb͕a ọsọ n'iru ya.

6. Ma ọ dighi mb͕e nna-ya mere ihe nēwuta ya n'ubọchi ndu-ya nile, si, Gini mere i meworo otú a? ọzọ kwa, onye ahu bu onye di nma n'aru nke-ukwu; nne-ya mu-kwa-ra ya mb͕e amusiri Absalom.