Bible Nso

Ezikiel 2 Bible Nso (IGBOB)

1. Ọ we sim, Nwa nke madu, guzo n'ukwu-gi abua, M'gāgwa kwa gi okwu.

2. Mọ Chineke we bata nimem mb͕e Ọ gwaram okwu, we me ka m'guzo n'ukwum abua; m'we nu otù Onye nāgwam okwu.

3. O we sim, Nwa nke madu, Mu onwem nēziga gi jekuru umu Israel, jekuru mba di iche iche ndi nānupu isi, ndi nupuworo isi n'okpurum: ha onwe-ha na ndi bu nna-ha ejehiewo megidem, rue n'ubọchi nke ta.

4. Umu-ha bu kwa ndi nēnweghi ihere n'iru, ndi obi-ha di ike; Mu onwem nēziga gi jekuru ha: i gāsi kwa ha, Otú a ka Onye-nwe-ayi, bú Jehova, siri.

5. Ma ha onwe-ha, ma ha gānu, ma ha gāghara, (n'ihi na ulo nnupu-isi ka ha bu,) ha gāmara na onye-amuma anọwo n'etiti ha.

6. Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, atula egwu ha, atu-kwa-la egwu okwu nile ha, asi na ogwu na uke di n'ebe i nọ, asi kwa na ọ bu n'etiti akpi ka i bi: atula egwu okwu nile ha, atu-kwa-la ujọ iru-ha, n'ihi na ulo nnupu-isi ka ha bu.

7. I gāgwa kwa ha okwum nile, ma ha gānu, ma ha gāghara: n'ihi na ndi nānupu isi nke-uku ka ha bu.

8. Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, nu ihe Mu onwem nāgwa gi; abula onye nānupu isi dika ulo ahu nke nānupu isi: saghepu ọnu-gi, rie ihe ahu nke Mu onwem nēnye gi.

9. M'we hu, ma, le, otù aka nke esetipuru nyem; ma, le, nime ya ka akwukwọ-npiakọta di;

10. O we b͕asa ya n'irum; ma edere ya-ri ihe n'iru na azu: ma ihe edere ya-ri nime ya bu abù-ákwá di iche iche, na isu-udè, na ahuhu.